Ihe anya anyị hụrụ n'agha Naịjirịa - Ndị so lụọ agha Biafra

Aha onyonyo, Ihe anya anyị hụrụ n'agha Nigeria Civil War - Ndị so lụọ agha Biafra
Ihe anya anyị hụrụ n'agha Naịjirịa - Ndị so lụọ agha Biafra
Foto Godwin Alabi-Isama, nna nna Meji dịka o ji igwe ndịagha ji ezikọrịta ozi.

Ebe foto si, Godwin Alabi-Isama

Mgbe e biputara ya

Ụfọdụ ndị Naịjirịa nọ n'oge agha Nigeria Civil War ekwuola oke ihe mgbu nakwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ ha gabigara n'agha ahụ.

Pịa aka ebe a ka i kirie vidio akụkọ a.

BBC Afrịca Eye gbara ụfọdụ ndị ahụ ajụjụ ọnụ dịka ha kọwara etu agha ahụ si gbanwee ma metụta ndụ ha,

Godwin Alabi-Isama bụ onyeagha Naịjirịa so lụọ agha ahụ. Ọ dị naanị afọ 28 oge ahụ mana ugbua, ọ dị afọ 85.

Ugwumba Nwoke a mara dịka Corporal Nwafor dị afọ 16 oge agha ahụ, bụ onyeagha Biafra.

Mmadụ abụọ a lụrsoro onwe ha agha n'agha Biafra nke ụfọdụ na'akpọ 'nigeria Civil War'.

Alabi-Isama kọwara ihe mere o ji debanye aha ya dịka onyeagha Naịjirịa n'afọ 1960.

"Oge Ezenwaanyị Elizabeth II bịara Naịjirịa n'afọ 1957, ahụrụ m ọtụtụ ndịagha na-eme ngagharị oge ahụ, ọ bụ ya mere m ji gwa onwe m na m ga-abụ onyeagha."

Foto Corporal Nwafor na Godwin Alabi-Isama oge ha na-agwa BBC Africa Eye okwu

O kwuru na ọ hapụrụ ụlọ nna na nna ya ma ba banye dịka onyeagha Naịjirịa. Ọ kọwara na e dugara ya na ọtụ™ụ ndị otu ya na mba Briten ma nye ha ọzụzụ pụrụiche.

Ka Naịjirịa nwetara nwereonwe ya n'afọ 1960, Alabi-Isama na ọtụtụ ndị Naịjirịa ụfọdụ gụrụ akwụkwọ na mba ofesi laghacjitere Naịjirịa ịbịa nwere ụfọdụ ọrụ ndị ahụ ndị ọcha na-ahapụ Naịjirịa hapụrụ.

O kwuru na ọ bụ oge ahụ ka a chọpụtara mmanụ agbidi na na Naịjirịa.

"N'ọnwa Jenụwarị 15, 1966 ndịagha napụrụ ọchịchị n'ike na Naịjirịa. Nke bụ ihe gbanwere ihe niile", ka o kwuru.

E gburu ndị ndọrọndọrọ ọchịchị iri abụọ na abụọ na ya, ha niile bụ ndị si mpaghara ugwu Naịjirịa. A tọọrọ ma gbuoa Abubakar Tafawa Bal ewa bụ Praịm minista Naịjirịa mbụ.

Ọ bụ ogbugbu ndị a bụ ihe mere e ji malite igbu ndị Igbo.

Col Ojukwu bụ Gọvanọ mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa oge ahụ kwputara na e gburu ọtụtụ ndị Igbo gụnyere ụmụnwaanyị, ụmụaka ma mụnye ụlọ obibi ha, ụlọahịa nakwa ụgbọala bu ndị Igbo ọkụ.

Foto ndịagha civil defence na-enweta ọzụzụ n'Enugwu na Ọgọst 1957. Enugwu bụ isiobodo Biafra oge ahụ.

Ebe foto si, Getty Images

Alabi-Isama kwuru na ọ bụghị naanị ogbugbu ka a chọrọ igbu ndị Igbo, o kwuru na a chọkwara ịnapụ ha ihe ụfọdụ ha nwere.

O kwuru na dịka onyeagha Naịjirịa, ndịisi ya gwara ya ka o gbuo ndị Igbo mana o kwuru na ọ chọghị ime ya.

Corporal Nwafor kọwara etu agha ahụ si gbanwee ndụ ya.

N'okwu ya "Oge anyị na-etolite, oge anyị bụ ụmụaka, ndụ dị ụtọ. Udo jupụtara, ihe niile na-aga nke ọma. Onye niile hụrụ onwe ha n'anya."

O kwuru na Naịjirịa bụ ọpụrụiche oge ahụ ma kọwaa na enweghị ihe dịka ajọ ụzọ, ohi, mpụ nakwa ajọ ihe na-eme ugbua.

Ọ kọwakwara ọtụtụ ihe ndị ọzọ anya ya hụrụ nke gụnyere etu e si gbuo ụmụaka, bepụ ụfọdụ aka nakwa ọtụtụ njinji ndị ọzọ mere.

O kwuru na ihe ruru mmadụ nde atọ nwụrụ n'agha ahụ.

A gbakwara ụfọdụ ụmụnwaanyị ajụjụọnụ dịka ha kọwakwara ihe ha gabigara n'agha ahụ nakwa etu o si gbanwee ndụ ha.

Onye hụrụ maka akụkọ a bụ Meji Alabi bụ nwa Alabi-Isama, kwuru na ihe mere ya ji mee akụkọ a bụ maka na ọ bụ ihe mepere anya ya nye ọtụtụ mere n'oge agha ahụ.

A mụrụ Meji Alabi gbara afọ 37 na Lọndọn mana ọ gụrụ akwụkwọ n'Amerịka. Ọ bụ onye na-ahazi vidio bekee kpọrọ director.

N'afọ ise gara aga, Meji ritere onyinye Grammy maka iso hazie vidio egwu Brown Sking Girl nke otiegwu Beyonce gụrụ.

Meji Alabi bụ onye na-ahazi vidio a ma ama. O kwuru na ihe mere o ji mee akụkọ a bụ iji kọwaa ihe ụfọdụ ndị Naịjirịa gabigara n'agha Nigeria Civil War

Ebe foto si, Meji Alabi