Akụkọ dị mkpa - Eprel 14, 2026
Akụkọ dị mkpa - Eprel 14, 2026
Gee ihe na-eme n'ụwa taa n'otu nkeji:
- Ọkaikpe Rilwan Aikawa nke ụlọikpe Ukwu Etiti dị na Kaduna Steeti enyela Nasir El-Rufai bụbu Gọvanọ steeti ahụ ntọhapụ beelu.
- Cheta na ụlọọrụ Independent Corrupt Practices and Other Related Offences Commission (ICPC) boro El-Rufai ebubo nrụrụaka dị iche iche nakwa mmetọ ụlọọrụ ya oge ọ bụ Gọvanọ steeti ahụ.
- Pati African Democratic Congress' nke David Mark nọ n'isi ya, ekwuola na nnukwu ọgbakọ ha ga-aga n'ihu n'ụbọchị Tuzde abalị iri na anọ nke ọnwa Eprel, 2026 n'agbanyeghị esemokwu onye bụ onyeisioche ha nakwa nsogbu iweta ogige ha ga-anọ mee ọgbakọ ahụ.
- Nnukwu ọgbakọ a na-abịa dịka a na-atụ anya mkpebi ụlọikpe mkpegharị banyere ikpe na onye bụ onyeisioche pati ADC n'ime David Mark na Nafi Bala.
- Maka akụkọ banyere nnukwu ọgbakọ ADC, pịa aka na BBCNewsIgbo.com.
Soyere anyị na websaịtị, Instagram, Facebook na WhatsApp chanelụ maka akụkọ niile na-eme n'ụwa.






