N'Enugwu, ndị IMT majara onye ntaakụkọ BBC, ndị uweojii kpọchiri ya

Ebele Ekeopara

Ebe foto si, Ebele Ekeopara

Nkọwa foto, Ebere bụ onye ntaakụkọ BBC nọ n'Enugwu

Ndị ụlọakwụkwọ Institute of Management and Technology (IMT) dị n'Enugwu sogburu onye ọrụ ntaakụkọ BBC Ebere Ekeopara dịka ndị uweojii kpọchiri ya.

Ekeopara gara ime akụkọ gbasara mwepụ e wepụrụ ịkpa oke dị n'etiti asambodo nke mahadum politeknik bụ HND na nke ndị mahadum yunivasiti bụ B.sc oge onyeisi ngalaba "Business Administration and Management" bụ Syvester Onah jidere ya.

Onah kpọrọ Oliakụ Ekeopara onye aghụghọ na-ekwu ihe ọ bụghị tupu ọ kpọọ ndị nchekwa ụlọakwụkwọ ahụ ka ha nwụchie ya.

Ekeopara kwuru na mbọ niile ya gbara ịkọwara ha na ya na-arụ ọrụ ya dị ka mmiri a wụrụ n'okwute dịka ha kpagburu ya, mee ya akaja ma dọrọ ya gaa n'ụlọọrụ onyeisi ụlọakwụkwọ ahụ.

Onyeisi ụlọakwụkwọ ahụ bụ Austine Nweze jụrụ ige ya ntị tupu ọ kpọọ onyeisi ndị nche n'ụlọakwụkwọ ahụ ka ọ kpọọ ndị uweojii.

Oge ndị uweojii bịara, ha kpọrọ Ebere pụọ, nara ya ekwentị ya, kpochie ya na ụlọọrụ ndị uweojii n'Ogui rue ọtụtụ oge.

N'okwu Ekeopara, "Onah jidere m, kpọọ m onye na-eyi egwu na onye na-abụhgị onye m na-ekwu na m bụ. Ọ gbalịrị ịkpọ ụmụakwụkwọ ka ha tie m ihe. Dịka ha na-achọ ime ya, ha mebiri akụkụ ụgbọala m.

"Egosiri ụmụakwụkwọ akwụkwọ ọrụ m mana ha achọghị ige m ntị. Ndị nche mmadụ asaa nke Onah gwara ka ha mee m ihe kwagharịrị m aka, dọrọ m gaa n'ụlọọrụ ha ma gbalia iji ike nara m ekwentị m ọtụtụ oge.

Ugbọọla
Nkọwa foto, Ha mebiri ụgbọala Ebere

"Oge m ruru n'ụlọọrụ onyeisi ụlọakwụkwọ ahụ, akọwara m ya etu ndị ọrụ ya si mekpaa m ahụ n'ọnụ ụzọ mana ọ gwara onyeisi ndị nche ya bụ CSO n'aha ịchafụ ka ọ kpọọ ndị uweojii ka ha nwụchie m"

Oge Ekeopara ruru na nke ndị uweojii, ha jidere ya n'azụ kanta.

BBC kpọrọ ụlọọrụ onyeisi ndị uweojii na ndị isi ndị ọzọ ka ahapụ onye ntaakụkọ ha ozugbo.

Nke a mere kọmishọna ndị uweojii n'Enugwu bụ Mohammed Danmallam jiri nye iwu ka a hapụ Ebere.

Tupu a hapụ ya, onye uweojii nọ n'ụlọọrụ ha mere ya n'ike ka ọ banye aka n'akwụkwọ nhapụ ego puku naịra 150.

Ihe ndị uweojii kwuru maka ihe a

Oge BBC kpọrọ onye na-ahụ maka ụlọọrụ ndị uweojii n'Ogui bụ Arthur Amobi, o kwuru, "Agaghị m aza gị ma yabụrụ na ịbịaghị n'ụlọọrụ m."

Mana onye nkwuchiteọnụ ndị uweojii na steeti ahụ bụ Ebere Amarizu kwuru na a nwụchiri Ekeopara maka na e che na ọ bụghị onye ntaakụkọ n'ezie.

"Agwara m maka nwuchi Ebere mana ndị uweojii chọrọ ịmata ma ọ bụ onye ntaakụkọ n'ezie."

Na nkezi afọ ole a na-atụanya mmadụ ga-adị ndụ site n'ọmụmụ bụ 72 - ya bụ 70 nke nwoke na 75 nke nwaanyị. Mana, nke a na-agbanwe kwa ka ndụ na-aga. Iji maatụ, onye dị afọ 69 ga-atụ anya ibikwa afọ 17 ọzọ.

N'ihe gbasara ego e kwuru na ọ ga-akwụ, Amarizu kwuru na ọ bụ iwu na onye ọbụla ndị uweojii na-ahapụ ga-abanye aka ịkwụ ego ka ha ghara ịgba ọsọ.

Onye nkwuchiteọnụ ụlọakwụkwọ IMT bụ Ifeanyi Ojobor gwara BBC na ya amaghị ihe ọbụla gbasara ihe ahụ mere.

Oge BBC kpọrọ onyeisi ụlọakwụkwọ ahụ, o kwuru na onye ntakụkọ ahụ kwesiri ịnata ikike n'aka ndị ụlọakwụkwọ ahụ tupu o mee ihe ọbụla ebe ahụ.

N'okwu ya, "Ọ nọ na-agba ndị mmadụ ajụjụọnụ na-anataghị ikike. Agwala m ndị uweojii ka ha wepu ikpe ahụ."

Presentational grey line

Akụkọ ga-amasị gị:

Presentational grey line

Vidio

  • 'Aloe vera' bụ osisi ndị na-emepụta ọgwụ na nri ji emepụta ngwa eji elekọta ahụ
  • Foto na-egosi sakramentị dị ngọzi
  • Esi m n'ịgba ọkada banye n'ịkwọ ụgbọelu- Captain Callistus
  • Ụlọikpe Kachasị etinyeghachila pati ADC n'aka David Mark
  • foto Justice Chidiebere Mark
  • A nwuchiela onye uweojii gbagburu mmadụ na Delta Steeti
  • Ezenwaanyị egwu Egedege sị na egwu ya si n'aka nne na nna ya fee ya n'aka
  • Etu ndị Iswap si gbuo mmadụ 29 n'Adamawa Steeti
  • Maazị Ibezi
  • Foto Onyeisiala Trump na Eze Charles
  • Ihe na-eme na mba Mali.
  • Dọkịta na-ahụ maka eze, Okereke Ogbonaya
  • Oge onye ojiegbe wakporo ọgbakọ Onyeisiala Donald Trump na Washington
  • Ihe ị ga-eme iji gbanahụ mgbu ma ị na-ahụ nsọ gị
  • Foto Evado oge ọ na-agwa BBC News Igbo okwu
  • Ihe i kwesịrị ịma maka nje Covid 19 ọhụrụ batara na Naịjirịa
  • Foto na-egosi okpunnabụenyi
  • Iwu Naịjirịa ọ kwadoro mmadụ ịgbanwe ụbọchị a mụrụ ya?
  • Ego ole a na-ere 'nomination form' na Naịjirịa, Frans na mba ndị ọzọ
  •  Davis Offor a ma ama dịka 'Clarus Mgbeojirikwe' n'ihe nkiri "New Masquerade"

Akụkọ akachasị gụọ