Arsenal abatala agba nke anọ na Europa league

Mgbe e biputara ya

Danny Welbeck gbaara Arsenal akaahịa unyaahụ n'asọmpi ha na AC Milan sọrọ n'ọgbọ egwuruegwu Emirate.

Arsenal gbara AC Milan ọkpụ atọ asatara otu (3 - 1) agbanyeghị na AC Milan bụ ụzọ nye golu.

Welbeck ji penariti saa goolu ahụ ndị AC Milan nyere ma sikwaa ọnwụ tinye ọzọ ka ọ fọrọ nkeji anọ ka e gbuchie bọọlụ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ọ bụ Hakan Calhanoglu satara otu goolu ndị AC Milan nyere ihe dịka nkejị anọ Welbeck nyechara goolu penariti ahụ.

Nke a pụtara na Arsenal abanyela n'agba nke kwọta faịnal n'Europa League.

Nke a bụ nke mbụ kemgbe 2010 ndị Arsenal bụ ebe nwafọ Naịjirịa Alex Iwobi na-agba bọọlụ ruru ọgbọ a.

N'otu aka ahụ, ndi otu nwafọ Naịjirịa bụ Ahmed Musa bụ CSKA Moscow, ji ọkpụ atọ asatara abụọ (2 - 3) merie Lyon.

Musa nyere otu golu n'ime goolu atọ ahụ.

Nke ahụ pụtakwara na CSKA abanyela agba nke kwọta faịnal.

A ga-amata ndị ha na ibe ha ga agba boolu mgbe e mechara nhọrọ nke taa.