You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Akụkọ dị mkpa - Mee 22, 2026
Akụkọ dị mkpa - Mee 22, 2026
Mgbe e biputara ya
Gee ihe na-eme n'ụwa taa n'otu nkeji:
- Otu ahụike mbaụwa bụ World Health Organisation (WHO) ekwuola na o nwere ike iwe ọnwa itoolu tupu e mepụta ọgwụ mgbochi nje Ebola nke a na-akpọtụ ugbua.
- Onyeisi WHO bụ Tedros Ghebreyesus, kwuru na a na-enyo ihe karịrị mmadụ narị isii enyo na ha bu ọrịa Ebola, ebe mmadụ otu narị na iri atọ na itoolu a na-enyo enyo butere ya anwụọla.
- Mba Siera Lionu anabatala ndị mbịarambịara si Afrịka Amerịka gbaara ụgbọ nwamkpi n'atụmatụ ọchịchi Donald Trump mapụtara megide ndị mbịarambịara agbasoghị iwu mbarambịara n'Amerịka.
- Ndị a kpọlatara gụnyere ndị Naijiria, Gana na Senegal, bụ ndị mbụ na-alọta na nkwekọrịta ahụ dị n'etiti Siera Lionu na Amerịka.
- Onyeisiala Bola Tinubu ahọpụtala Ọkammụta Segun Aina, nke Obafemi Awolowo University, ka ọ bụrụ onye ga-anọchi onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka ule Jamb bụ to Ishaq Oloyede maliter n'ọnwa Juun, 2026.
Soyere anyị na websaịtị, Instagram, Facebook na WhatsApp chanelụ maka akụkọ niile na-eme n'ụwa.