Onye ndị uweojii na-eche wakporo ụlọọrụ Inec n'Ọlụ, Imo Steeti

ụlọ awakporo

Ebe foto si, INEC Twitter

Mgbe e biputara ya

Ndị uweojii Imo steeti ekwuola na ndị echere bụ ndị otu amachịrị amachị bụ Indigenous People of Bioafra nke bụ Ipob n'ịchafụ na aka ike otu a bụ Eastern Security Network(ESN) wakporo ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka nke bụ Inec n'ịchafụ n'ụbọchị abụọ nke ọnwa Sepụtemba n'ihe dịka elekere anọ nke ụtụtụ.

Ọ bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii steeti ahụ bụ Michael Abattam depụtara nke a n'akwụkwọ ozi ha zipụrụ ma sị na ndị a bịara n'igwe ha ma tụọ ogbunigwe arụrụ n'ụlọ n'ime ogige ụlọọrụ ahụ.

O kwuru sị, " Ha bịara n'igwe ha, na-atụ ogbunigwe ma na-agba egbe. Kama ndị uweojii ekweghị ha mezuo uche obi ha".

O kwuru na ndị uweojii nọ n'ogige ahụ gbasoro ndị omekome a egbe nke mere na ọtụtụ n'ime ha bu mgbọ n'ahụ gbafuo.

Abattam kwuru na enweghị onye nwụrụ ma sịkwa na enweghị ngwa ọgụ ọbụkla ndị ahụ nwereike ịnweta.

O sị, " Ya bụ ogbunigwe ha tụrụ emetụtaghị ụlọ Inec kama na ọ bụ ọbere ụlọ ndị nmchekwa ka ha bụ ogbunigwe metụtara ọbere.

Ọ kọwara na ha ebidola nyocha ha ma sị na ọcheghị na ndị omekome a gatere aka n'ihi etu ọbara siri ụsasịa n'ala mgbe ndị omekome a na-agba ọsọ.

N'aka nke ọzọ ka Kọmịshọna ndị uweoji steeti ahụ bụ Mohammed Ahmed Barde toro ndị uweojii etu ha siri gbochie ebum n'ụche ndị omekome a ma gbaa ha ume ka ha jisie ike hụ na-ejidere ndị omekome niile n'Imo steeti ma kpee ha ikpe etu ọ kwesịrị.

ụlọọrụ Inec awakporo

Ebe foto si, INEC Twitter

Ihe ndị ụlọọrụ Inec kwuru maka mwakpo a

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post

Ngalaba na-ahazi ntụliaka na Naịjirịa bụ INEC n’ịchafụ ekwuola na ndị omekome awakpola ma gbaa ụlọorụ ha dị n’Orlu ọkụ.

Ha kwuru na ndị omekome ahụ tọọrọ ndị na-arụgharị ụlọ atọ n’ime mmadụ asaa ma mechaa tọghapụ ha.

Kọmịshọna Inec n'Imo steeti bụ Sylvia Agu kwuru na ụlọ nke a gbara ọkụ bụ nke ndị omekome wakpoburu n'oge gara aga a na-arụgharị.

O kwukwara na mwakpo ahụ kaara ị ka njọ karịa etu ọ dị ma ewezuga ndị uweojii gbataara ha ọsọ enyemaka ozugbo ozugbo.

Nke a ga-eme ya ugboro anọ n'izuụka anọ a ga-awakpo ụlọọrụ Inec dị na steeti dị icheiche dịka awakpoburu Ogun, Osun nakwa Ebonyi steeti.