Etu mmachi otu jikọtara ndị keke si emetụta ndị Anambra steeti

Aha onyonyo, Etu mmachi a si emetụta ndị steeti ahụ
Etu mmachi otu jikọtara ndị keke si emetụta ndị Anambra steeti
Mgbe e biputara ya

Ndị bi n'Anambra steeti gwara BBC Igbo etu mmachi gọọmentị steeti ahụ machiri keke na bọọsụ si emetụta ha.

Ha kwuru na kemgbe a machiri ụgbọala ndị a, na ịgara mkpa ha na-arazị ahụ.

Ebe ụfọdụ kwuru na iji naanị ụkwụ agagharị na-egbuzi ha mgbu n'ahụ, ndị ọzọ kwuru na ọ bụ ha bụ "ụmụogbenye" na-enweghi ụgbọala nke ha ka ọ kacha emetụta.

Ndị na-anya keke ji ohere ahụ gwa gọọmentị ka ha mee ebere ma butuo ego ole gọọmentị na-ana ha n'ụtụisi.

Mmachi a machiri ndị Keke

Cheta na Gọọmentị Anambra steetị depụtaburu akwụkwọ maka mmachị a na steeti ahụ, ebe ha nọ kọwaa na ihe kpatara ya bụ mmachi bụ maka etu ụfọdụ ndị otu a sị azọ ọkwa onyeisioche ga na-anakọta ego n'ọgbọ (park) ha.

Nke a mere ka gọọmentị steetị ahụ machie ha ọnwa isii ruo mgbe gọọmentị ga-enyochacha ihe butere nsogbu n'etiti ha.

Gọọmentị kwukwara na ndị otu a na-ebute ọgbaaghara n'obodo, ma kwuo na machi a ga-enyere ndị otu ahụ aka ịhazigharị onwe ha, họpụta ndị isi bụ nke gọomentị ga-amata dịka ndị isi ha.

Gọọmentị na ndị otu a kwekọrịtaburu na ha ga-amailte ịna ụtụisi dị icheiche ma hibekwa ụsọrọ enyemaka ga-enyere ndị ọkwọụgbọala aka, ọkachasị n'ahụike ha.

Na ya bụ nkwekọrịta, ndị keke ga-amalịte ịkwụ N4,000 n'izuụka maọbụ N15,000 n'ọnwa.

Ndị Keke nọ n'okpuruọchịchị asatọ ebe e nwere ọnọdụ onye apụla ezi n'abalị, ga-akwụ N3000 n'izụụka maọbụ N12,000 n'ọnwa.

Ndị dị etu a ga-amalitekwa ịkwụ N4000 kwa izuụka nakwa N15,000 kwa ọnwa mgbe e wepuru ọnọdụ onye apụla ezi n'ogbe ha.

Ndị bọọsụ ga-akwụwa N5000 kwa izu na N20,000 kwa ọnwa.

Ndị bọọsụ ASUU ga-akwụwa N2500 kwa izu maọbụ N10,000 kwa ọnwa rụọ mgbe e mepere ụlọakwụkwọ, bụ mgbe ha ga-amalite ịkwụ N5,000 nakwa N20,000.