A kwụsịla ndị Katọlik ife ofufe n'Adoration Ministry Fada Mbaka

Father Ejike Mbaka

Ebe foto si, Adoration Ministry

Mgbe e biputara ya

Bishọp ụka katọlik nke Enugwu Dayọsis bụ Bishọp Callistus Onaga enyela iwu sị ka ndị ụka ha kwụsị ife ofufe n’Adoration Ministry nke Fada Ejike Mbaka.

O nyere iwu a site n’akwụkwọ ozi o wepụtara n’ụbọchị 17 ọnwa Juun, 2022.

Bishop sị na mmachi a ga-adị ruo mgbe e mere nnyocha ndịisi ụka Katọlik na-eme n’isi Fada Mbaka

Ọnụ na-ekwuru Katọlik Enugwu bụ Fada Benjamin Achi, gwara BBC Igbo na ọ bụ Bishọp Onaga tinyere aka n'akwụkwọ ahụ.

Iwu mmachi

Ebe foto si, Catholic Enugu

Ihe mere Bishọp Onaga ji nye iwu a

Ozi a sị “N’ihi ọtụtụ ihe ndị na-eme n’Adoration Ministry nke megidere okwukwe na nkuzi ndị Katọlik; a dọọla Fada Mbaka aka na ntị ọtụtụ oge mana o geghi ntị na ntuziaka ndị a.”

“Site n'ikike na ọrụ m dịka onyeisi ọzụzụ atụrụ nke Katọlik Enugwu Dayọsis, amachiela ndị Katọlik (ụkọchukwu, ndị ụka) ịga n’Adoration Ministry efe ofufe ruo mgbe e mechara nnyocha ndị ndu Katọlik na-eme n’isi Fada Mbaka”.

Bishọp Onaga gakwara n’ihu rịọ sị ka ndị ụka Kraịst niile kpeere Fada Mbaka na ụka Katọlik ekpere.

Iwu mmachi

Ebe foto si, Catholic Enugu

Mmachi a na-abịa n’ụbọchị ole na ole Father Ejike Mbaka buru amụma sị na Peter Obi ji aha Labour Party azọ ọkwa Onyeisiala agaghị emeri maka na ọ bụ onye aka ntachi.

Amụma a Fada Mbaka buru mere ka ọtụtụ ndị mmadụ gbarụọ ihu ma katọọ ya n’ụzọ dị iche iche.

N’ihi nke a Mbaka wepụtara ozi n’ụbọchị Fraịde 17 Juun, sị na ọ gọziela Peter Obi ma rịọ ndị nkwado ya mgbaghara.