Ụzọ ise mmadụ ga-esi gbochie abụba n'ime afọ

Aha onyonyo, Ụzọ ndị mmadụ nwereike isi gbochie abụba ịgbakọ n’ime afọ
Ụzọ ise mmadụ ga-esi gbochie abụba n'ime afọ
    • Onye dere ya, Uzoamaka Ewuzie
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist
    • Ebeg o si, Legọs
  • Mgbe e biputara ya

Abụba afọ bụ otu ihe na-echere ndị ntoroọbịa aka mgba ọkachasị dịka o metụtara ịdị mma nakwa ezigbo ahụike. Mmụba abụba afọ na-eme ka iyi uwe ndị masịrị mmadụ sie ike.

A chọpụtala na abụba dị n'afọ nwereike ịdị njọ nyere ahụike gị. O nwereike ibutere gị ọtụtụ nsogbu ahụike siri ike, gụnyere ọbara mgbali elu, oke shuga dị n'ọbara, na ọrịa ndị sitere na abụba bekee kpọrọ 'cholesterol'.

Abụba dị n'ime afọ na-emekwa ka mmadụ nwee ụdị ọrịa shuga a kpọrọ 'type 2 diabetes' na ọrịa obi.

Nnyocha e bipụtara na Mahadum Harvard chọpụtara na abụba afọ na-emepụta ụdị 'protein' a na-akpọ 'cytokine' karịa, nke na-akpata ahụ ọzịza.

Abụba afọ na-emepụtakwa 'protein' a na-akpọ 'angiotensin', nke na-akpata ọbara mgbali elu, ọrịa nchefu, ụkwara ume ọkụ, na ụdị ọrịa kansa ụfọdụ.

Gịnị na-akpalite abụba afọ?

Ndị ọkachamara kwuru na ihe ndị na-akpata mmụba abụba dị n'afọ, gụnyere mkpụrụ ndụ 'genetics', mgbanwe 'hormone', afọ ole mmadụ dị, oke ibu na ịkwụsị ịhụ nsọ.

Ibi ndụ na-adịghị mma na erighị nri kwesịrị ekwesị bụkwa ihe na-akpata ya.

Lee ihe ise ị ga-eme iji ibelata abụba afọ:

Nke mbụ, i kwesịghị iri ihe ọ bụla awa abụọ maọbụ atọ tupu ị lakpuo ụra. Nri ị na-eri na-enye gị ike iji arụ ọrụ ụbọchị ahụ, mana nri ị na-eri n'abalị na-eme ka abụba gbakọọ, ma na-akpalitekwa oke ibu.

Nke abụọ, gbaa mbọ ka ị na-eri nri jupụtara na 'fibre' nakwa protein n'ihi na ọ na-eme ka afọ gị juu ogologo oge, ma mee ka agụụ belata maọbụ etu isi eri nri ugboro ugboro.

Nke atọ, zere nri 'carbohydrate' a rụrụ arụ. Nri dịka achịcha ntụ ọka bụ 'bread', chips, na crackers, nke enweghị 'fibre' na-agbari ngwa ngwa, na-eme ka shuga dị n'ọbara gị na-arị elu na mberede.

Mgbe ogogo shuga dị n'ọbara gị na-agbanwe ngwa ngwa, ọ na-eme ka agụụ na-agụ gị, ma bulie ohere gị ibu ibu na inwe ọrịa shuga.

Nke anọ, enweghị ụra zuru oke nwereike imetụta 'hormones' agụụ ma na-eme ka ị na-achọ iri nri karịa dịka nnyocha e mere na Mahadum California kwuru na homonu na-akpalite agụụ na-eto ma ọ bụrụ na mmadụ ehighị ụra nke ọma.

Ndị ọkachamara kwuru na anyị kwesịrị izere ndọkasị ahụ n'ihi na ọ na-eme ka mmadụ na-eri nri ekwesịghị ekwesị.

Nke ise, ọ dị oke mkpa ka anyị na-emegharị ahụ iji wezuga ihe ndị na abaghị uru n'ahụ mmadụ, belata oke abụba ọkachasị n'ime afọ.

Mmegharị ahụ dịka ije ije ngwa ngwa, ịgba ọsọ, ịnya igwe, igwu mmiri, maọbụ 'yoga' na-ebelata abụba na-emekwa ka 'metabolism' gị na-arụsi ọrụ ike ngwa ngwa.

Megharị ahụ na-agbatị akwara, na-akwalite ọnọdụ ahụike obi gị, na-ebelata abụba dị n'ime afọ, ọrịa shuga, ọbara mgbali elu na nkpọchi obi.