Asari Dokubo: Ikposa ntuliaka gọvanọ Anambra megidere mbọ inweta Biafra

Asari Dokubo

Ebe foto si, Getty Images

Mgbe e biputara ya

Otu 'Defacto Biafra Customary Government' nke Asari Dokubo bụ onye ndu ya, akatọọla ihe ha kpọrọ iji aka ike kwụsị ntuliaka ọkwa gọvanọ a ga-eme n'Anambara steeti n'ọnwa Nọvemba.

N'ozi mgbasaozi nke ọnụ na-ekwuchitere otu ahụ bụ Uche Okafor-Mefor binyere aka ma wepụta ụbọchị Wenezde, otu ahụ kwuru na nke a megidere mbọ a na-agba inweta Biafra.

Otu ahụ sị na mbọ ọbụla ikposa ntuliaka Anambra agaghị enwe isi.

Otu ahụ katọkwara ihe ha kpọrọ ọgbụgbụ a "na-egbusịsị ndị Biafra n'ala Biafra".

Otu De Facto Customary Government of Biafra kwuru na ntuliaka ọkwa gọvanọ ga-aga n'ihu etu iwu Naijiria si hibe ya. Ha kwuru na ndị mmadụ igbahapụ ntuliaka a na ala Biafra agaghi amipụta mkpụrụ ọbụla ma kwu kwa na ma ha achọrọ ya ma ha achọghị ya, gọọmentị ga-etinye onyeisi na steetị ahụ.

Ha rụrụ aka n'okwu ndị mmadụ na-ekwu maka ịgbahapụ ntuliaka a, kwuo na ha anabataghị ya.

Otu a katọrọ ogbugbu a na-egbu ndị mmadụ n'ala Biafra, kwuo na nke a megidere iwu ala Naijiria nakwa nke otu jikọtara mba ụwa niile.

Ohaneze Ndigbo: Ihe mere anyị ji arịọ Ipob ka ha hapụ ka e mee ntụliaka Anambra

Ndị Okenye Igbo na ndị na-eti mkpu Biafra

Ebe foto si, BBC/Getty

Otu Ohaneze Ndigbo arịọla otu Ipob ka ha kagbuo atụmatụ nọrọ n'ụlọ otu izu ha na-akwado ime n'Ọwụwa Anyanwụ iji nye ohere ka e mee ntuliaka gọvanọ Anambra steeti.

Na nsonso a Ipob kporo oku nọrọ n'ụlọ malite n'abalị ise nke ọnwa Novemba rue abalị iri nke ọnwa Novemba, afọ 2021 ma ọ bụrụ na gọọmentị atọhapụghị onye ndu ha bụ Nnamdi Kanu.

Mana Ohaneze site n'ozi nke ọnụ na-ekwuru ha bụ Alex Ogbonnịa binyere aka ma wepụta ụbọchị Wenezde, abalị 26 nke ọnwa Oktoba, afọ 2021, Ohanaeze Ndigbo sị na " Ikposa ntuliaka Anambara steeti ga-eweghachị Igbo azụ n'ebe ọ dị ugbua."

"N'ụzọ ọbụla Anambara bụ isi ahụrụ kwaba okpu n 'Ọwụwa Anyanwụ n'ịkpali ịgba mbọ e jiri mara Igbo, dịka ndị okenye anyị agahị agba nkịtị ewu anwụọ n'ọgbụrị."

Ọhaneze kwakwara arịrị na ọ bụrụ na nọrọ n'ụlọ ahụ ga-emetụta akwamozu Victoria Agụiyi Ironsi, nwunye Agụiyi Ironsi bụ onye a ga-akwa n'Ụmụahịa n'abalị ise nke ọnwa Novemba.

"A ma ihe Ọchịagha JTU Aguiyi Ironsi bụrụ nye ndị Igbo. Anyị ji mkpụrụ obi ya ụgwọ."

Dịka ha na-arịọ otu Ipob arịrịọ, otu Ohaneze ji ohere ahụ kpọọ ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ ka ha kpọọ nzụkọ gbatagbata ndị ọnụ na-eru n'okwu na ndị ndu ndị ntọrn=obịa iji chọọ ụzọ a ga-esi bie okwu ihe na-eme n'Ala Igbo ugbua na etu aka ga-esi gba mbọ tọhapụ Nnamdi Kanu.

Ohaneze rụtụrụ aka na ọ bụ n'ihi oke ndịiche dị n'etiti ndị na-achị achị na ndị ntorobia soro bute nsogbu, sị na ọ dị mkpa ka e me ka ndị ntọrọbia hụta na ọ bụ ka ọ ga-esi dịị ha mma ka a na-achọ.

Otu ahụ gara n'ihu kwuo na ha kwụnyere otu ọbụla ji uche na amamihe na-eti mkpu maka etu e si akpachapụ ndị Igbo na Naijiria.

Ohanaeze Ndigbo gara n'ihu sị na ha kweneye na ịkparịta ụka ha na otu ndị ọzọ ọnọdụ Naijiria na-ewute dịka otu 'Southern and Middle Belt Leadership Forum nke Chief Edwin K Clarke bụ onye ndu ha.

Tọhapụnụ Nnamdi maọbụ anyị akpọchie mpaghara Ọwụwa Anyanwụ niile

Biafra

Ebe foto si, Getty Images

Otu 'Indigenous People of Biafra' (IPOB) ekwuola na ha ga-akpọchi mpaghara ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa niile ruo otu izuụka ma ọ bụrụ na atọhapụghị onyeisi ha bụ Nnamdi Kanu.

Emma Powerful, ọnụ na-ekwuru otu a kwuru nke a n'ụbọchị Satọde.

Powerful kwuru na ha agaghịzi agbachi nkịtị ka onyeisi ha bụ Nnamdi Kanu nọrọ n'ụlọ mkpọrọ na-enweghị ihe ọbụla o mere.

Okwu a Emma Powerful kwuru na-abịa dịka Abubakar malami bụ ọkaiwu gọọmentị etiti wepụtara akwụkwọ ozi n'ụbọchị Fraịde ebe ọ nọrọ bo Nnamdi Kanu na ndị IPOB ọtụtụ ebubo.

Powerful kwuru sị: "IPOB ga-akpọchi mpaghara Biafra niile malite n'ụbọchị ise ruo ụbọchị iri nke ọnwa Nọvemba."

"Naanị n'ụbọchị ụka bụ abalị asaa nke Nọvemba ka a ga-enwe mkpagharị ka ndị mmadụ ga kpeere Chineke."

"Anyị ga-eme nke a ma ọ bụrụ na gọọmentị Naịjirịa atọhapụghị onyeisi anyị bụ Nnamdi Kanu tupu abalị anọ nke ọnwa Nọvemba."

"A ga-atọhapụrịrị onye ndu anyị n'ihi na onweghị ihe ọjọọ ọbụla o mere megidere iwu."

Aha onyonyo, Ọ bụrụ na Gọọmentị akpụtaghị Nnamdi Kanu n'ụlọikpe echi ... - Ifeanyi Ejiofor

Emma Powerful kwuru na ha ghọtara na mkpọchi obodo a ga-ebutere ndị mmadụ nhịahụ, "mana anyị ga-eme ya maka ọdị mma nke ndị Biafra."

O kwuru na ha bụ ndị IPOB chọpụtara na gọọmentị etiti achọghị ikpe Nnamdi Kanu ikpe n'ụzọ ziri ezi, "kama ha chọrọ imenye ya ihere ma hapụ ya ka ọ nọrọ n'ụlọmkpọrọ ndị DSS taa nchara".

"Anyị hụrụ etu e si gbochie ndị ọkaiwu, ndị ntaakụkọ na ndị okenye ndị Igbo ịbata n'ime ụlọikpe ebe a nọrọ kpee Nnamdi kanu ikpe."

"Anyị agaghị anabata ụdị ihe a ọzọ. Anya agaghị ekwe ka e kpee onyeisi anyị ikpe na nzuzo maobụ ka e were ụzọ sharia kpee ya ikpe n'ụdị ọbụla."