Rivers Flooding: 'Idemmiri achụbatala agwọ n'ime ụlọ anyị'

Ide Mmiri

Ebe foto si, Odogu Emman

Mgbe e biputara ya

Ndị mmadụ bi n'ụfọdụ ebe na Rivas steeti etiela mkpụ rịo ka gọọmentị were ọsọ were ije bịa nyere ha aka dịka idemmiri na-enye ha ọsọ n'obodo ha.

Ọtụtu ndị bi na Rumuokwurushi akwapụla maka mkpamkpa idemmiri na-akpa ebe ahụ.

Ka ọ dị ụgbua, ha na-eji ụgbọmmiri abata ma na-apụ n'ụlọ ha.

Ide Mmiri
Nkọwa foto, 'Ajọ nsị na ọrịa na-echere anyị aka mgba.' - Favour Ikechukwu

Otu nwaanyị bụ Beatrice Offem, onye ụlọ ya dị n'ogige obibi 'Valley of Decision' gwara onye ntaakụko BBC na kamgbe ọnwa Sepụtemba, na ha na-eji ụgbọmmiri eme njem.

Offem kwuru si "Anyị na-egbu agwọ na anụ ndị ọzọ idemmiri na-ebubata n'ime ụlọ anyị".

Onye jị ụgbọ aga n'elu idemmiri.
Nkọwa foto, ' Kamgbe 2016 ka idemmiri mewere anyị ịwa' - Innocent Dominic

O kwukara sị "Mmiri a na-erute anyị n'obi, ihe anyị chọrọ bụ ezigbo ọwammiri maka na anyị enweghi ọwammiri ebe a".

O kwukwara na ha na-akwụ ndị na-akwọ ụgbọmmiri a otu narị naịra iji bufee ha.

Idemmiri na Rmumuokwurushi
Nkọwa foto, Ndị ji ụgbọmmiri na Rmumuokwurushi.

N'aka nke ọzọ ka ndị bi n'Ahọada, Abua na Ogba Egbema, Ndoni na-ekwu na idemmiri awakpoola ha kamgbe 2017.

Ndị ọrụ ụgbo na-abọ ihe ha kuru tupu ọ ruo oge ya.

Ebe foto si, Odogu Emman

Nkọwa foto, Joy Brown abọọla ihe ọ kụrụ tupu ha eruo oge ha.

Baseme Akio kwuru na idemmiri a na-ebutere ha ọrịa dị iche iche dịka ịba na azụ mgbu.

O kwukwara sị na ha ahụbeghị enyemaka gọọmentị.

Ide mmiri

Ebe foto si, Odogu Emman

Nkọwa foto, Ndị bi n'Ahọada na-ekwu na id mmiri na-ebutere ha ọrịa dị iche iche.

Ihe ndị otu gbatagbata NEMA nwere ikwu

Onyeisi ndị otu ọrụ gbatagbata bụ National Emergency Management Authority (NEMA) nke mpaghara Ndịda-Ndịda bụ Ibarakumo Walson, gwara BBC na ha achọpụtala na ọ bụ mmiri ịsọfe oke, enweghị owammiri na oke idemmiri (flash Floods) kacha ebute nsogbu.

Ibarakumo Walson
Nkọwa foto, "N'oge na-adịghị anya, mmiri nwere ike ilo obodo ndị a" - Ibarakumo Walson

Walson kwuru na ọ bụru na egwughị ala mmiri, ma rụọkwa ọwammiri, na ndị obodo a ga na-ata ahụhụ afọ niile.

Akụkọ ga-amasị gị

Ihe nkiri ga-amasị gị

Aha onyonyo, Innoson Motors: Etu m si bido ịgba mbọ