Goodluck Jonathan: Obama 'tinyere ọnụ n'ihe agbasaghị ya' na ntuliaka 2015

Aha onyonyo, Goodluck Jonathan: Obama 'tinyere ọnụ n'ihe agbasaghị ya' na ntuliaka 2015
Mgbe e biputara ya

Goodluck Jonathan bụbu onyeisiala Naịjirịa kwuru na onye otu ya chịburu Amerịka bụ Barrack Obama, tinyere aka na ntuliaka 2015.

Jonathan kwuru na ọ bụ aka Amerịka tinyere mere ka ọ ghara ịzọta ọkwa onyeisiala ọzọ na 2015.

Oge ntuliaka ahụ ruru nso, Obama mere onyonyo ebe o gwara ndị Naịjirịa okwu, ma zite John Kerry bụ odeakwụkwọ kachasị nke Amerịka mgbe ahụ, ka ọ bịa Naịjiria maka ndọtị adọtịrị ntuliaka ahụ site Febrụwarị ruo Maachị maka okwu nchekwa dị oge ahụ.

Jonathan kwuputara nke a na mkparịtaụka ya na BBC nwere dịka Naịjirịa na-akwado maka ntuliaka na-abịa na Febrụwarị 2019.

O kwuru na ebe ekwesịghị ijide ya aka maka ntọ a tọrọ ụmụakwụkwọ 278 n'obodo Chibok, na ọ gaghị ewepụ onwe ya n'ụta maka etu ndị ọrụ nchekwa si daa mba ịgbapụta ha.

Ihe karịrị ụmụakwụkwọ 100 ka nọ n'agbụ ndị Boko Haram.

Akụkọ ga-amasị gị: