E nwela nyọcha ọbara ịma nwaanyị ga-amụkwo nwa

Nwaanyị dị ime

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Nwaanyị dị ime ime nyocha ahụ dị mkpa maka ịma ọnọdụ ahụike ya na nwa ya
Mgbe e biputara ya

Nchọpụta ndị ọkamụta mere na mba Amerịka na-egọsi na enwela nyocha ọbara nwere ike igosi nwaanyị dị ime ga-amụ nwa n'oge erughi eru.

David Stevenson, onye duru ndi otu ya na ụlọọrụ nchọpụta a kpọrọ, 'March of Dimes Prematurity Research Centre' nke dị na mahadum Stanford dị na mba Amerịka kọwara usoro ọhụrụ ahụ bụ ụzọ ´iji gee nti na mkparitaụka na-aga n'etiti nne, nwa nakwa alọnwa" nke ụfọdụ ma dịka 'ichi (placenta) na enyeghị afọime nsogbu ọbụla.

Stevenson kwuru na nchọpụta ọhụrụ ga-enye aka ịma ọnwa ole nwa nọ n'afọ dị.

"Site ilile ọbara nne, anyị nwere ịhụ ka jiini (gene) si aga oge afọime na-aga nke ọma ma chọpụta ma egwu dagharia n'usoro a nke ga-egosi dọkịta na ihe amaghị kwụrụ nwere ike ibute ịmụkwo nwa na-eme."

Stevenson kwuru na ịganihu nna nyocha a nwere ike inye aka ka amata jiini nakwa ụzọ ha si egosi ihe butere ịmụkwo nwa nakwa ụzọ a ga-esi gbalahụ nsogbu ahụ.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ