Na Zambia, afọ ọsịsa abadola ndị ṅụrụ ọgwụ ike dimkpa

Ụlọọgwụ

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Cholera banyere na Zambia ugbua
Mgbe e biputara ya

Akụkọ onye ntaakụkọ BBC, Kennedy Gondwe wetere site na Zambia na akọwa na ebujere ụmụ nwoke atọ ụlọ ọgwụ maka ha egosiri njirimara ọrịa kọlera mana nchọpụta e mere gosiri na ha ṅụrụ ọgwụ ike dimkpa.

Kemgbe afọ gara aga ka Zambia na- ebuso ọrịa Kọlera batara obodo ha agha.

Kọlera egbuola mmadụ iri asaa, ma metụ mmadụ ruru puku atọ.

Mana, akụkọ na-egozi na mmadụ atọ a esoghị na ndị kọlera metụtara.

Ihe ozi si Zambia na- akọwa bụ na ọ bụ mmanya ka ndị atọ ahụ no na-aṅụ tupu ha banye ịṅụ ọgwụ ike dimkpa a na-akpọ, 'mvubwe' na mba ahụ.

Onye ọrụ gọọmentị mpahara Zambia ebe ihe a mere bụ Chanda Kasolo, gwara BBC na ka mmadụ atọ a bidoro igbọ agbọ, e buru ha gawa ebe a na-agwọ ndị Kọlera metụtara.

Ka e mere ha nyocha, a chọpụtara na ọ bụ ọgwụ ike dimkpa ka ha ṅụrụ.

Ndị a ka nọ n' ụlọọgwụ, mana ha na-adị mma.